Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ya mere, onye ya ọbụla nʼetiti ndị ya nwere ike ịga Jerusalem nke dị na Juda, gaa wuo ụlọnsọ Onyenwe anyị, Chineke Izrel, bụ Chineke nọ na Jerusalem. Ka Chineke ha nọnyekwara ha.

Ezra 1:3 in English

Ezra 1:3 · Berean Standard Bible

Whoever among you belongs to His people, may his God be with him, and may he go to Jerusalem in Judah and build the house of the LORD, the God of Israel; He is the God who is in Jerusalem.

Context

1Nʼafọ mbụ nke ọchịchị Sairọs, eze Peshịa, ime ka okwu Onyenwe anyị nke sitere nʼọnụ Jeremaya mezuo, Onyenwe anyị kpaliri mmụọ Sairọs, eze Peshịa ka o mee mkpọsa nʼalaeze ya niile, ma denyekwa ya nʼakwụkwọ iwu, sị, 2“Otu a ka Sairọs, eze Peshịa kwuru, “ ‘Onyenwe anyị Chineke nke eluigwe, e nyela m alaeze* niile nke dị nʼụwa, o nyekwala m ọrụ iwuru ya ụlọnsọ na Jerusalem, nke dị na Juda. 3Ya mere, onye ya ọbụla nʼetiti ndị ya nwere ike ịga Jerusalem nke dị na Juda, gaa wuo ụlọnsọ Onyenwe anyị, Chineke Izrel, bụ Chineke nọ na Jerusalem. Ka Chineke ha nọnyekwara ha. 4Ma nʼobodo ọbụla ebe ndị fọdụrụ ndụ bi, ka ndị nọ nʼebe ahụ nye ha onyinye ọlaọcha na ọlaedo, na akụ na anụ ụlọ nʼụzọ enyemaka, tinyere onyinye afọ ofufu maka ụlọnsọ ukwu Chineke nke dị na Jerusalem.’ ” 5Mgbe ahụ, Chineke tinyere ọchịchọ ịlaghachi Jerusalem* nʼobi ndịisi ezinaụlọ Juda na Benjamin na ndị nchụaja, na ndị Livayị. Ha kwadokwara ịlaghachi maka ịrụ ọrụ ụlọnsọ Onyenwe anyị ahụ na-atụfughị oge.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.