Izikiel 9:3
Ezekiel 9:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ebube nke Chineke Izrel sitere nʼelu cherubim ndị ahụ, ebe ọ nọ na mbụ, bilie bịa guzokwa nʼọnụ ụzọ ụlọnsọ ahụ. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị kpọrọ nwoke ahụ yi uwe akwa ọcha bụ onye nya akpa ahụ nke ihe e ji ede ihe dị nʼime ya,
Ezekiel 9:3 in English
Ezekiel 9:3 · Berean Standard Bible
Then the glory of the God of Israel rose from above the cherubim, where it had been, and moved to the threshold of the temple. And He called to the man clothed in linen who had the writing kit at his side.
Context
1Mgbe ahụ, a nụrụ m ka o ji oke olu kpọọ oku sị, “Bịanụ nso, unu bụ ndị ahọpụtara ilekọta obodo a, onye ọbụla jidekwa ngwa agha nʼaka ya.” 2A hụrụ m ndị ikom isii si nʼọnụ ụzọ ama nke dị nʼakụkụ ebe dị elu na-apụta, nke chere ihu nʼugwu, onye ọbụla jikwa mma agha nʼaka ya. Otu onye nʼime ha yi uwe akwa ọcha, nyarakwa nwa akpa nke ihe e ji ede akwụkwọ dị nʼime ya. Ha niile batara nʼime ụlọnsọ, guzokwa nʼakụkụ ebe ịchụ aja e ji bronz wuo. 3Ma ebube nke Chineke Izrel sitere nʼelu cherubim ndị ahụ, ebe ọ nọ na mbụ, bilie bịa guzokwa nʼọnụ ụzọ ụlọnsọ ahụ. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị kpọrọ nwoke ahụ yi uwe akwa ọcha bụ onye nya akpa ahụ nke ihe e ji ede ihe dị nʼime ya, 4ọ sịrị ya, “Bilie, jegharịa nʼokporoụzọ niile nke obodo Jerusalem, kakwasị akara nʼegedege ihu ndị niile na-akwa akwa na ndị niile na-asụ ude nʼihi ihe arụ niile nke a na-eme nʼime ya.” 5Anụkwara m ka ọ gwara ndị ọzọ, “Soronụ ya baa nʼime obodo, gbukwaanụ, unu emekwarala onye ọbụla ebere maọbụ ọmịiko.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.