Izikiel 8:16
Ezekiel 8:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O mere ka m baa nʼime ogige dị nʼime ụlọ ukwu nke Onyenwe anyị, nʼebe ahụ, nʼọnụ ụzọ ụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị, nʼagbata ebe ịchụ aja na mpụta ọnụ ụlọ ahụ, ka ihe ruru iri mmadụ abụọ na ise guzo, chee ihu ha nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ na-efe anyanwụ. Ha gbakụtara ụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị azụ mgbe ha na-eche ihu nʼọwụwa anyanwụ na-akpọ isiala nye anyanwụ.
Ezekiel 8:16 in English
Ezekiel 8:16 · Berean Standard Bible
So He brought me to the inner court of the house of the LORD, and there at the entrance to the temple of the LORD, between the portico and the altar, were about twenty-five men with their backs to the temple of the LORD and their faces toward the east; and they were bowing to the east in worship of the sun.
Context
14O mere ka m bịakwa nʼọnụ ụzọ ahụ dị nʼakụkụ ugwu nke ụlọnsọ nke Onyenwe anyị. Nʼebe ahụ, ahụrụ m ndị inyom nọ na-akwa akwa nʼihi Tamuz, chi ha. 15Mgbe ahụ, ọ sịrị m, “Ị hụla ihe ndị a, nwa nke mmadụ? Ị ga-ahụkwa ihe arụ ndị dị ukwuu karịa ndị a.” 16O mere ka m baa nʼime ogige dị nʼime ụlọ ukwu nke Onyenwe anyị, nʼebe ahụ, nʼọnụ ụzọ ụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị, nʼagbata ebe ịchụ aja na mpụta ọnụ ụlọ ahụ, ka ihe ruru iri mmadụ abụọ na ise guzo, chee ihu ha nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ na-efe anyanwụ. Ha gbakụtara ụlọnsọ ukwu nke Onyenwe anyị azụ mgbe ha na-eche ihu nʼọwụwa anyanwụ na-akpọ isiala nye anyanwụ. 17Ọ sịrị m, “Ị hụla nke a, nwa nke mmadụ? Ọ bụ ihe dị nta nye ụlọ Juda, bụ ime ihe arụ niile ndị a ha na-eme nʼebe a? Ha ga-ejikwa ihe ike mejupụta ala, siri otu a na-akpasu m iwe mgbe niile? Lee ka ha si nọgide na-akparị m, na-etinye alaka nʼimi ha. 18Nʼihi ya, aga m eme ka ha nụrụ ụfụ iwe m, ọ dịkwaghị onye m ga-ahapụ. Ọ bụrụkwa na ha anọgide na-ebe akwa nʼoke olu, agaghị m aṅa ha ntị.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.