Native Bible

Ezekiel 6:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe ozu ndị e gburu egbu ga-atọgbọsị nʼetiti arụsị niile, na nʼebe ịchụ aja niile, na nʼugwu nta niile, na nʼugwu ukwu niile, na nʼokpuru osisi ọbụla, na nʼokpuru osisi ook niile, ebe ha na-anọ na-esure ụda na-esi isi ụtọ nye arụsị ha.

Ezekiel 6:13 in English

Ezekiel 6:13 · Berean Standard Bible

Then you will know that I am the LORD, when their slain lie among their idols around their altars, on every high hill, on all the mountaintops, and under every green tree and leafy oak—the places where they offered fragrant incense to all their idols.

Context

11“ ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, kụkọọ ọbọ aka gị abụọ ọnụ, zọkwaa ụkwụ gị nʼala, ma tisikwaa mkpu akwa ike site nʼobi mwute, nʼihi ihe ọjọọ niile na omume rụrụ arụ ndị Izrel mere. Nʼihi na ha ga ịla nʼiyi site nʼoke ụnwụ, na site nʼagha, na site nʼọrịa na-efe efe. 12Ndị nọ nʼebe dị anya ga-anwụ site nʼọrịa na-efe efe, ndị nọ nso ga-anwụ site na mma agha, ndị fọdụrụ ndụ ga-anwụ site nʼagụụ. Aga m eme ka ha nụrụ ụfụ oke iwe m. 13Unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe ozu ndị e gburu egbu ga-atọgbọsị nʼetiti arụsị niile, na nʼebe ịchụ aja niile, na nʼugwu nta niile, na nʼugwu ukwu niile, na nʼokpuru osisi ọbụla, na nʼokpuru osisi ook niile, ebe ha na-anọ na-esure ụda na-esi isi ụtọ nye arụsị ha. 14E, aga m esetipụ aka m megide ha, mee ka ala ha laa nʼiyi, nʼebe niile ha bi, site nʼọzara* ruo na Ribla. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’ ” 6:14 Maọbụ, mbara ịkpa

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.