Izikiel 5:14
Ezekiel 5:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Nʼihi ya, aga m eme ka ị bụrụ ihe e bibiri ebibi, na ihe e ji eme ihe ọchị nye mba niile gbara gị gburugburu, na nʼihu ndị na-agafe nʼụzọ ahụ.
Ezekiel 5:14 in English
Ezekiel 5:14 · Berean Standard Bible
I will make you a ruin and a disgrace among the nations around you, in the sight of all who pass by.
Context
12Otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke ndị bi nʼime gị ga-anwụ site nʼagụụ maọbụ na ọrịa; otu ụzọ ga-anwụ site na mma agha nke ndị iro nọ nʼazụ mgbidi gị, otu ụzọ fọdụrụ ka a ga-achụsa nʼifufe, a ga-eji mma agha ndị iro chụsasịa ha. 13“Mgbe ahụ, iwe m ga-akwụsị, ọnụma m megide ha ga-adajụkwa, na nke a ka a ga-abọrọ m ọbọ. Ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị kwuru okwu site nʼekworo mgbe m mezuru ọnụma m nʼahụ ha. 14“Nʼihi ya, aga m eme ka ị bụrụ ihe e bibiri ebibi, na ihe e ji eme ihe ọchị nye mba niile gbara gị gburugburu, na nʼihu ndị na-agafe nʼụzọ ahụ. 15Ị ga-abụ ihe e ji eme ihe ọchị na ihe nkọcha nye mba dị iche iche gbara gị gburugburu, mgbe m ga-eji iwe na obi ọkụ na ntaramahụhụ dị egwu kpee gị ikpe, mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola. 16Mgbe m gbara gị àkụ ọjọọ ahụ na-eweta ọnwụ na ịla nʼiyi, bụ àkụ nke oke ụnwụ, aga m agba gị ya, gbajaa gị. Aga m anọgide na-ezite ụnwụ tutu ruo mgbe e mere ka ihe oriri kọọ gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.