Native Bible

Ezekiel 48:30 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Ndị a ga-abụ ọnụ ụzọ ama e si apụ nʼobodo ahụ. “Nʼakụkụ nke ugwu, nke ịdị ogologo mgbidi ya bụ kilomita abụọ,

Ezekiel 48:30 in English

Ezekiel 48:30 · Berean Standard Bible

“These will be the exits of the city: Beginning on the north side, which will be 4,500 cubits long,

Context

28Ma oke ala Gad nke chere ihu nʼakụkụ ndịda ga-esi na Tama ruo nʼiyi Meriba Kadesh, sorokwa ọdọ mmiri Ijipt ruo nʼosimiri Mediterenịa. 29“Nke a bụ ala unu ga-ekenye ebo Izrel niile dịka oke ha. Ha ga-abụkwara ha ihe nketa.” Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya. 30“Ndị a ga-abụ ọnụ ụzọ ama e si apụ nʼobodo ahụ. “Nʼakụkụ nke ugwu, nke ịdị ogologo mgbidi ya bụ kilomita abụọ, 31ọnụ ụzọ ama obodo ahụ ga-abụ aha ebo niile nke Izrel. Ọnụ ụzọ ama atọ nʼakụkụ ugwu ga-abụ ọnụ ụzọ ama Ruben, ọnụ ụzọ ama Juda, na ọnụ ụzọ ama Livayị. 32Nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, nke mgbidi ya dị kilomita abụọ nʼogologo, ọnụ ụzọ ama atọ ga-adị ya. Ha ga-aza ọnụ ụzọ ama Josef, ọnụ ụzọ ama Benjamin, na ọnụ ụzọ ama Dan.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.