Izikiel 48:20
Ezekiel 48:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ala ahụ niile, ma ala ahụ e doro nsọ, ma ala ndị obodo, ga-adị kilomita iri na atọ nʼakụkụ ya ọbụla.
Ezekiel 48:20 in English
Ezekiel 48:20 · Berean Standard Bible
The entire portion will be a square, 25,000 cubits by 25,000 cubits. You are to set apart the holy portion, along with the city property.
Context
18Ma nke ga-afọdụ na ya, nʼakụkụ oke ala ahụ dị nsọ nke gara ogologo ya niile, ga-abụ nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ kilomita ise na ọkara nʼakụkụ ọdịda anyanwụ ga-abụkwa kilomita ise na ọkara. Ihe omume ya ga-abụ nri nye ndị ọrụ nke obodo ahụ. 19Ndị ọrụ si nʼobodo, bụ ndị na-akọ ya ga-abụkwa ndị sị nʼebo niile nke Izrel. 20Ala ahụ niile, ma ala ahụ e doro nsọ, ma ala ndị obodo, ga-adị kilomita iri na atọ nʼakụkụ ya ọbụla. 21“Ala niile fọdụrụ nʼakụkụ abụọ nke ala ahụ dị nsọ, na ala ndị obodo ga-abụ nke nwa eze. Ọ ga-agbatị ruo ọwụwa anyanwụ site nʼọtụtụ kilomita iri na atọ nke oke ahụ dọ nsọ ruo nʼoke ala ọwụwa anyanwụ, sitekwa na kilomita iri na atọ nʼakụkụ ọdịda anyanwụ ruo oke ala ọdịda anyanwụ. Akụkụ abụọ ndị a nke gbatịrị ruo nʼoke ala ndị obodo ga-abụ nke onye ọchịchị, ebe nsọ ahụ na ụlọ ukwu ahụ ga-adị nʼetiti ha. 22Ya mere, oke ala nke ndị Livayị na ala ndị obodo ga-adị nʼetiti ala nke nwa eze nwee. Oke ala nke nwa eze ahụ ga-adị nʼetiti oke ala Juda na oke ala Benjamin.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.