Native Bible

Ezekiel 48:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nke a ga-abụ ala dị nsọ e debere iche nye ndị nchụaja. Nʼakụkụ ugwu, ịdị ogologo ala ahụ ga-abụ kilomita iri na atọ. Nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, ogologo ya bụ kilomita ise na ọkara. Ogologo nke akụkụ ndịda na nke ugwu bụ otu. Otu a kwa, ogologo nke akụkụ ọwụwa anyanwụ na ọdịda anyanwụ bụ otu. Ebe nsọ Onyenwe anyị ga-adị nʼetiti ya.

Ezekiel 48:10 in English

Ezekiel 48:10 · Berean Standard Bible

This will be the holy portion for the priests. It will be 25,000 cubits long on the north side, 10,000 cubits wide on the west side, 10,000 cubits wide on the east side, and 25,000 cubits long on the south side. In the center will be the sanctuary of the LORD.

Context

8“Ala nke ya na oke ala ndị Juda ga-agbatị site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ, ka ị ga-enye dịka onyinye pụrụ iche. Obosara ya ga-abụ ihe dị kilomita iri na atọ. Ogologo ya site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ ga-aha ka ala otu ebo ketara. Ụlọnsọ ukwu ahụ ga-adịkwa nʼetiti ya. 9“Ogologo ebe a ewepụtara iche nye Onyenwe anyị ga-adị kilomita iri na atọ, obosara ya ga-abụ kilomita ise na ọkara. 10Nke a ga-abụ ala dị nsọ e debere iche nye ndị nchụaja. Nʼakụkụ ugwu, ịdị ogologo ala ahụ ga-abụ kilomita iri na atọ. Nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, ogologo ya bụ kilomita ise na ọkara. Ogologo nke akụkụ ndịda na nke ugwu bụ otu. Otu a kwa, ogologo nke akụkụ ọwụwa anyanwụ na ọdịda anyanwụ bụ otu. Ebe nsọ Onyenwe anyị ga-adị nʼetiti ya. 11Ọ ga-adịrị ndị nchụaja, bụ ụmụ Zadọk ndị e doro nsọ, ndị sitere nʼikwesị ntụkwasị obi jeere m ozi, ndị na-esiteghị nʼiso ụzọ m kpafuo dịka ndị Izrel na agbụrụ Livayị mere mgbe ha mehiere. 12Ọ bụ onyinye pụrụ iche a na-enye ha site nʼala ahụ dị nsọ, bụ ala ahụ kachasị nsọ, nke ya na ala ndị Livayị nwekọrọ oke ala.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.