Izikiel 47:17
Ezekiel 47:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Oke ala ahụ ga-esite nʼoke osimiri gbasoro oke ala nke ugwu Damaskọs ruo Haza Enan. Oke ala ndị Hamat ga-adịkwa nʼakụkụ ugwu. Nke a ga-abụ oke ala nke akụkụ ugwu unu.
Ezekiel 47:17 in English
Ezekiel 47:17 · Berean Standard Bible
So the border will run from the Sea to Hazar-enan, along the northern border of Damascus, with the territory of Hamath to the north. This will be the northern boundary.
Context
15“Nke a ga-abụkwa oke ala nke ala unu ahụ.
“Nʼakụkụ ugwu, ọ ga-esite nʼosimiri Mediterenịa nʼakụkụ ụzọ Hetlon, gafee Lebo gawa Zedad, 16site ya ruo Berota na Sibraim (nke dị nʼoke ala dị nʼagbata Damaskọs na Hamat), rukwaa na Haza Hatikon, nke dị nʼoke ala Hauran. 17Oke ala ahụ ga-esite nʼoke osimiri gbasoro oke ala nke ugwu Damaskọs ruo Haza Enan. Oke ala ndị Hamat ga-adịkwa nʼakụkụ ugwu. Nke a ga-abụ oke ala nke akụkụ ugwu unu. 18Oke ala nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ga-esite nʼagbata Hauran na Damaskọs soro akụkụ osimiri Jọdan, nʼagbata ndị Gilead na ala ndị Izrel ruo nʼosimiri dị nʼọwụwa anyanwụ, ruokwa Tama. Nke a ga-abụkwa oke ala unu nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ. 19Oke ala na ndịda, ọ ga-esite na Tama ruo ọbụladị mmiri Meriba Kadesh, soro ụzọ ọdọ mmiri iyi Ijipt ruo osimiri Mediterenịa. Nke a bụ oke ala ahụ na ndịda.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.