Izikiel 46:6
Ezekiel 46:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼụbọchị mmemme ọnwa ọhụrụ, ọ ga-eweta otu nwa oke ehi, ụmụ atụrụ isii na otu ebule, ha niile ọ dịghị nke ga-enwe ntụpọ ọbụla.
Ezekiel 46:6 in English
Ezekiel 46:6 · Berean Standard Bible
On the day of the New Moon he shall offer a young, unblemished bull, six lambs, and a ram without blemish.
Context
4Ihe nwa eze ahụ ga-eji chụọrọ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ nʼụbọchị izuike na nʼoge mmemme ọnwa ọhụrụ ga-abụ ụmụ ebule isii, na otu ebule, ndị na-enweghị ntụpọ. 5Ọ ga-eweta ihe e ji achụ aja mkpụrụ ọka, nke bụ iri lita ụtụ ọka abụọ na abụọ, na otu ebule. Ọ ga-ewetakwa lita mmanụ oliv asaa maka iri lita ụtụ ọka abụọ na abụọ ahụ, tinyere onyinye ụmụ atụrụ dịka o si masị ya. 6Nʼụbọchị mmemme ọnwa ọhụrụ, ọ ga-eweta otu nwa oke ehi, ụmụ atụrụ isii na otu ebule, ha niile ọ dịghị nke ga-enwe ntụpọ ọbụla. 7Ọ ga-ewetakwa otu oke ehi na iri lita ụtụ ọka iri abụọ na abụọ, maka aja mkpụrụ ọka. Ọ ga-enye ebule ahụ na iri lita ụtụ ọka iri abụọ na abụọ. Ọ ga-enyekwa ụmụ atụrụ ndị ahụ na ụtụ ọka dịka o si masị ya inye ha, tinyere iri lita ọka abụọ na abụọ, nke ọ ga-eweta maka lita mmanụ oliv asaa. 8Mgbe nwa eze ga-abata nʼụlọ ahụ, ọ ga-esite na mpụta ọnụ ụlọ nke ọnụ ụzọ ama, ebe ahụ kwa ka ọ ga-esikwa pụọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.