Native Bible

Ezekiel 46:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe nke a gasịrị, o duuru m site nʼọnụ ụzọ dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama kpọbata m nʼọnụụlọ ndị ahụ dị nsọ, nke chere ihu nʼugwu, nke bụ ihe nketa ndị nchụaja. O gosiri m otu ebe dị na nsọtụ akụkụ ọdịda anyanwụ.

Ezekiel 46:19 in English

Ezekiel 46:19 · Berean Standard Bible

Then the man brought me through the entrance at the side of the gate into the holy chambers facing north, which belonged to the priests, and he showed me a place there at the far western end

Context

17Ọ bụrụkwanụ na o kenye otu nʼime ndị ohu ya ala site nʼihe nketa ya, ala ahụ ga-abụ nke ohu ahụ tutu ruo nʼafọ inwere onwe, nke bụ afọ asaa ọbụla. Mgbe ahụ, ohu ahụ ga-enwere onwe ya, ma ala ahụ ga-aghọkwa nke nwa eze ahụ. Ihe nketa ya bụ nke dịịrị naanị ụmụ ya, nke ha ka ọ bụ. 18Nwa eze ahụ agaghị ewere ala ọbụla site nʼihe nketa ndị mmadụ nʼaka ike, si otu a chụpụ ha site nʼala ha. Ala ọbụla ọ na-enye ụmụ ya ga-abụrịrị ihe nketa sitere nʼala nke aka ya. Ka a ghara ime ka ọ bụladị otu nʼime ndị m bụrụ onye e kewapụrụ site nʼihe nketa ha.’ ” 19Mgbe nke a gasịrị, o duuru m site nʼọnụ ụzọ dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama kpọbata m nʼọnụụlọ ndị ahụ dị nsọ, nke chere ihu nʼugwu, nke bụ ihe nketa ndị nchụaja. O gosiri m otu ebe dị na nsọtụ akụkụ ọdịda anyanwụ. 20Ọ sịrị m, “Ebe a ka ndị nchụaja ga-anọ sie anụ aja ikpe ọmụma na aja mmehie. Ebe a ka ha ga-anọkwa ghee onyinye mkpụrụ ọka, ka a ghara iwebata ha na mpụta ogige a nakwa ido ndị mmadụ nsọ.” 21Mgbe ahụ, o mere ka m pụta ọzọ nʼogige ezi. O duuru m gaa nʼakụkụ anọ nke ogige ahụ. Ahụrụ m na e nwere ogige nke dị nʼakụkụ ọbụla.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.