Izikiel 46:14
Ezekiel 46:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ị ga-ewetakwa onyinye mkpụrụ ọka kwa ụtụtụ kwa ụtụtụ tinyere ya, ihe niile ga-emejupụta ya bụ lita ụtụ ọka isii, na lita mmanụ abụọ e ji agwakọta ya. Iche onyinye mkpụrụ ọka a nʼihu Onyenwe anyị bụ ụkpụrụ ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
Ezekiel 46:14 in English
Ezekiel 46:14 · Berean Standard Bible
You are also to provide with it every morning a grain offering of a sixth of an ephah * with a third of a hin of oil * to moisten the fine flour—a grain offering to the LORD. This is a permanent statute.
Context
12“ ‘Mgbe ọbụla onyeisi chọrọ inye onyinye afọ ofufu, maka ịchụrụ Onyenwe anyị aja nsure ọkụ maọbụ aja udo, a ga-emeghere ya ọnụ ụzọ ime nke dị nʼọwụwa anyanwụ ka o si nʼebe ahụ bata. Ọ ga-enye onyinye ya dịka e si enye ya nʼụbọchị izuike. Emesịa, ọ ga-atụgharịa pụọ. A ga-emechikwa ụzọ ahụ mgbe ọ pụchara. 13“ ‘Ọ bụ nwa atụrụ gbara otu afọ nke na-enweghị ntụpọ ka ị ga-eweta ụbọchị niile maka ịchụ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị, ọ bụ kwa ụtụtụ, kwa ụtụtụ ka ị ga-eweta ya. 14Ị ga-ewetakwa onyinye mkpụrụ ọka kwa ụtụtụ kwa ụtụtụ tinyere ya, ihe niile ga-emejupụta ya bụ lita ụtụ ọka isii, na lita mmanụ abụọ e ji agwakọta ya. Iche onyinye mkpụrụ ọka a nʼihu Onyenwe anyị bụ ụkpụrụ ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 15Ya mere, ha ga-edozi nwa atụrụ na ụtụ ọka na mmanụ oliv ahụ, kwa ụtụtụ kwa ụtụtụ, maka aja nsure ọkụ a na-achụ kwa mgbe niile. 16“ ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, ọ bụrụ na onyeisi enye onye ọbụla nʼime ụmụ ya ndị ikom onyinye site nʼihe nketa ya, ihe ahụ ga-abụ nke ya, bụrụkwa nke mkpụrụ ya, ọ ga-abụ oke ha site nʼihe nketa ruo ebighị ebi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.