Native Bible

Ezekiel 45:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọzọkwa, otu atụrụ nke sitere nʼigwe atụrụ dị narị atụrụ abụọ, nke si nʼebe ịta nri nke Izrel a gbara mmiri nke ọma ka unu ga-eweta. A ga-eji ndị a chụọ aja mkpụrụ ọka, na aja nsure ọkụ, na aja udo, maka ikpuchiri ndị wetara ha mmehie ha. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.

Ezekiel 45:15 in English

Ezekiel 45:15 · Berean Standard Bible

And one sheep shall be given from each flock of two hundred from the well-watered pastures of Israel. These are for the grain offerings, burnt offerings, and peace offerings, to make atonement for the people, declares the Lord GOD.

Context

13“ ‘Nke a bụ onyinye pụrụ iche unu ga-enye: otu ụzọ nʼụzọ isii nke efa, site nʼotu homa nke ọka wiiti unu. Unu ga-enyekwa otu ụzọ nʼụzọ isii nke efa* site nʼotu homa ọka balị unu. 14Dịka e nyere ya nʼiwu, unu ga-eji ihe ọtụtụ baf, weta mmanụ oliv bụ otu ụzọ nʼime ụzọ iri* site nʼotu kọ ọbụla (kọ na-erita baf iri, nʼihi na baf iri, bụ ọtụtụ otu homa). 15Ọzọkwa, otu atụrụ nke sitere nʼigwe atụrụ dị narị atụrụ abụọ, nke si nʼebe ịta nri nke Izrel a gbara mmiri nke ọma ka unu ga-eweta. A ga-eji ndị a chụọ aja mkpụrụ ọka, na aja nsure ọkụ, na aja udo, maka ikpuchiri ndị wetara ha mmehie ha. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya. 16Ndị niile nke nʼala ahụ ga-eso nwa eze Izrel bute onyinye ndị a. 17Nwa eze ahụ ka ọ dịrị iweta ihe eji achụ aja nsure ọkụ niile, aja mkpụrụ ọka, aja ihe ọṅụṅụ niile, na nke Ọnwa ọhụrụ nakwa nke ụbọchị izuike niile, nʼoge mmemme niile nke ndị Izrel. Ọ ga-ewetakwa ihe eji achụ aja mmehie, aja mkpụrụ ọka, aja nsure ọkụ, aja udo maka ikpuchiri ụmụ Izrel mmehie ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.