Izikiel 44:24
Ezekiel 44:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“ ‘Ha ga-abụ ndị ikpe, idozi esemokwu dapụtara nʼetiti ndị m. Usoro iwu m niile ka ha ga-eji kpee ikpe. Ndị nchụaja nʼonwe ha kwa ga-erube isi nʼiwu m niile nʼoge mmemme ọbụla dị nsọ. Ha ga-ahụkwa na e doro ụbọchị izuike nsọ.
Ezekiel 44:24 in English
Ezekiel 44:24 · Berean Standard Bible
In any dispute, they shall officiate as judges and judge according to My ordinances. They must keep My laws and statutes regarding all My appointed feasts, and they must keep My Sabbaths holy.
Context
22Ha agaghị alụ nwanyị nke di ya nwụrụ anwụ, maọbụ nwanyị gbaara di ya alụkwaghị m. Kama ọ bụ naanị ụmụ agbọghọ ndị sitere nʼagbụrụ Izrel ndị na-amaghị nwoke, maọbụ nwunye ndị nchụaja nwụrụ anwụ. 23Ha ga-akụziri ndị m ihe dị iche nʼetiti ihe dị nsọ na ihe na-adịghị nsọ; gosi ha otu esi amata ihe dị iche nʼetiti ihe na-adịghị ọcha na nke dị ọcha. 24“ ‘Ha ga-abụ ndị ikpe, idozi esemokwu dapụtara nʼetiti ndị m. Usoro iwu m niile ka ha ga-eji kpee ikpe. Ndị nchụaja nʼonwe ha kwa ga-erube isi nʼiwu m niile nʼoge mmemme ọbụla dị nsọ. Ha ga-ahụkwa na e doro ụbọchị izuike nsọ. 25“ ‘Onye nchụaja agaghị emerụ onwe ya site nʼije nʼebe ozu dị, karịakwa maọbụ ozu nna ya maọbụ nne ya, ma o bụ nwa ya, maọbụ nwanne ya nwoke, maọbụ nwanne ya nwanyị na-enweghị di. 26Mgbe e mechara ka ọ dị ọcha ọzọ, ọ ga-echere ruo ụbọchị asaa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.