Native Bible

Ezekiel 43:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ị ga-enye ndị nchụaja bụ ndị Livayị si nʼezinaụlọ Zadọk, bụ ndị na-abịa m nso ife ofufe nʼihu m, otu oke ehi maka aja mmehie, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.

Ezekiel 43:19 in English

Ezekiel 43:19 · Berean Standard Bible

You are to give a young bull from the herd as a sin offering to the Levitical priests who are of the family of Zadok, who approach Me to minister before Me, declares the Lord GOD.

Context

17Nke dị nʼokpuru ga-adị mita asatọ nʼakụkụ ọbụla; a ga-arụlite ọnụ ọnụ ya gburugburu, ka ịdị elu nke ọnụ ọnụ ya bụrụ iri sentimita abụọ na asaa. Akụkụ ya niile gbasapụrụ site nʼelu ya ruo nʼala. Ọtụtụ mgbasapụ a dị iri sentimita ise na atọ. Nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ka ihe e ji arịgo ya dị.” 18Mgbe ahụ, ọ gwara m, “Nwa nke mmadụ, ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ndị a bụ usoro metụtara iwu ịchụ aja nke aja nsure ọkụ, na ifesa ọbara nʼelu ebe ịchụ aja mgbe e wusiri ya. 19Ị ga-enye ndị nchụaja bụ ndị Livayị si nʼezinaụlọ Zadọk, bụ ndị na-abịa m nso ife ofufe nʼihu m, otu oke ehi maka aja mmehie, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri. 20Unu ga-ewere ụfọdụ nʼọbara ya tee na mpi anọ nke ebe ịchụ aja, na nʼakụkụ anọ nke ebe ịchụ aja, na nʼakụkụ anọ nke mbadamba nkume dị nʼelu, na gburugburu ọnụ ọnụ ya, si otu a sachaa ebe ịchụ aja ahụ, kpuchikwaara ya mmehie. 21Mgbe ahụ, a ga-ewere nwa oke ehi e ji chụọ aja mmehie ahụ, kpọọ ya ọkụ nʼebe a kwadoro nʼezi ụlọnsọ ukwu ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.