Izikiel 42:19
Ezekiel 42:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, ọ tụgharịrị jirikwa ihe ọtụtụ ahụ tụọkwa akụkụ nke ọdịda anyanwụ. Ọ dị ihe ruru narị mita abụọ na iri mita isii na ise.
Ezekiel 42:19 in English
Ezekiel 42:19 · Berean Standard Bible
And he came around and measured the west side to be five hundred cubits long.
Context
17O ji mkpirisi osisi ahụ e ji atụ ihe tụọ akụkụ nke ugwu ma chọpụta na ọ dị ihe ruru narị mita abụọ na iri mita isii na ise. 18Ọ tụkwara akụkụ nke ndịda, chọpụtakwa na ọ dị ihe ruru narị mita abụọ na iri mita isii na ise. 19Mgbe ahụ, ọ tụgharịrị jirikwa ihe ọtụtụ ahụ tụọkwa akụkụ nke ọdịda anyanwụ. Ọ dị ihe ruru narị mita abụọ na iri mita isii na ise. 20Ya mere, ọ tụrụ akụkụ anọ niile nke ebe ahụ. Mgbidi gbara ya gburugburu. Ọtụtụ ha dị ihe ruru narị mita abụọ na iri mita isii na ise, nʼogologo, obosara ya dịkwa ihe ruru narị mita abụọ na iri mita isii na ise, iji kewapụta ebe dị nsọ site nʼebe ndị ọzọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.