Native Bible

Ezekiel 42:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, ọ sịrị m, “Ime ọnụụlọ niile dị nʼugwu, na ime ọnụụlọ ndị dị na ndịda, bụ ndị a chere ogige ụlọnsọ ahụ ihu, bụ ime ụlọ dị nsọ, nke ndị nchụaja. Ebe ndị nchụaja ndị na-abịa nso Onyenwe anyị ịchụ aja ga-anọ rie nri niile nke kachasị nsọ, nʼebe ahụ ka ha ga-edebekwa aja ịnata ihuọma, aja mmehie na aja ikpe ọmụma, nʼihi na ụlọ ndị a dị nsọ.

Ezekiel 42:13 in English

Ezekiel 42:13 · Berean Standard Bible

Then the man said to me, “The north and south chambers facing the temple courtyard are the holy chambers where the priests who approach the LORD will eat the most holy offerings. There they will place the most holy offerings—the grain offerings, the sin offerings, and the guilt offerings—for the place is holy.

Context

11Ụzọ njegharị dị nʼetiti akụkụ abụọ ụlọ ahụ, ha dịkwa ka ọnụụlọ ndị ahụ nke dị nʼụzọ ugwu. Ogologo ha na obosara ha bụ otu; ha niile yiri onwe ha. Ọnụ ụzọ ya dịkwa ka ọnụ ụzọ dị nʼugwu. 12Otu a ka ọnụ ụzọ e si abanye nʼime ọnụụlọ ndị a dị na ndịda si dị. E nwere ọnụ ụzọ na mpụta, nke dị na mgbidi ahụ chere ihu nʼọwụwa anyanwụ. Ebe a ka e si abanye nʼime ọnụụlọ ndị ahụ. 13Mgbe ahụ, ọ sịrị m, “Ime ọnụụlọ niile dị nʼugwu, na ime ọnụụlọ ndị dị na ndịda, bụ ndị a chere ogige ụlọnsọ ahụ ihu, bụ ime ụlọ dị nsọ, nke ndị nchụaja. Ebe ndị nchụaja ndị na-abịa nso Onyenwe anyị ịchụ aja ga-anọ rie nri niile nke kachasị nsọ, nʼebe ahụ ka ha ga-edebekwa aja ịnata ihuọma, aja mmehie na aja ikpe ọmụma, nʼihi na ụlọ ndị a dị nsọ. 14Mgbe ndị nchụaja bara nʼime ebe nsọ ahụ nke e kewapụrụ iche, ha aghaghị esikwa nʼebe ahụ pụta nʼogige mpụta ezi, tupu ruo mgbe ha yisara uwe ha yii jee ozi, nʼihi na uwe ndị a dị nsọ. Ha ga-eyiri uwe ọzọ, tupu ha abanye nʼakụkụ ụlọ ndị ahụ dịịrị ndị ọzọ.” 15Mgbe ọ tụchara ihe ndị dị nʼime ebe ụlọnsọ ahụ, o duuru m site nʼọnụ ụzọ dị nʼọwụwa anyanwụ pụta, tụkwaa nʼakụkụ niile gburugburu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.