Izikiel 41:5
Ezekiel 41:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ tụkwara mgbidi ụlọnsọ ukwu ahụ chọpụta na ịdị igbidi ya bụ mita atọ na ụma abụọ. E nwekwara ọnụụlọ ndị dị gburugburu ụlọnsọ ukwu ahụ, nke ọbụla dị mita abụọ na otu ụma nʼigbidi.
Ezekiel 41:5 in English
Ezekiel 41:5 · Berean Standard Bible
Next he measured the wall of the temple to be six cubits thick, and the width of each side room around the temple was four cubits.*
Context
3Mgbe ahụ, ọ banyere nʼime ime ebe nsọ ahụ, tụọ ogidi dị nʼọnụ ụzọ e si abanye nʼime ya, chọpụta na obosara nke ọbụla bụ otu mita na otu ụma, obosara ọnụ ụzọ ahụ nʼonwe ya dị mita atọ na ụma abụọ. Akụkụ aja nke ọnụ ụzọ ọbụla dị mita atọ na ụma asaa nʼobosara. 4Ọ tụrụ ogologo ime ebe nsọ ahụ, ya dị mita iri na ọkara, obosara ya dịkwa mita iri na ọkara, nʼogologo ụlọ ezumezu ahụ. Ma ọ sịrị m, “Ebe a bụ Ebe Kachasị Nsọ.” 5Ọ tụkwara mgbidi ụlọnsọ ukwu ahụ chọpụta na ịdị igbidi ya bụ mita atọ na ụma abụọ. E nwekwara ọnụụlọ ndị dị gburugburu ụlọnsọ ukwu ahụ, nke ọbụla dị mita abụọ na otu ụma nʼigbidi. 6Ọnụụlọ nta ndị a dị nʼokpukpu atọ, nke ọbụla nʼelu ibe ya, okpukpu ọbụla nwere iri ọnụụlọ atọ. E nwere mgbidi gbara aja ụlọnsọ ahụ gburugburu nʼakụkụ niile, ka ha bụrụ ihe nkwado nye ọnụụlọ nta ndị a, ka ihe nkwado ndị a ghara ịbụ ihe a rụnyere nʼaja ụlọnsọ ukwu ahụ. 7E wuru ọnụụlọ nta ndị a ka obosara ọnụụlọ ndị ahụ niile dị nʼelu ibe ha dị ukwuu karịa obosara ndị nke dị nʼokpuru ha. Nʼụzọ dị otu a, obosara ọnụụlọ niile dị nʼokpukpu nke abụọ dị ukwuu karịa nke dị nʼala; nke atọ dịkwa ukwuu karịa nke abụọ. E wukwara ebe e si arịgo site nʼokpukpu nke dịkarịsịrị ala rigoruo nʼọnụụlọ ndị kachasị elu, site nʼokpukpu nke dị nʼetiti.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.