Izikiel 41:21
Ezekiel 41:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọnụ ụlọ ezumezu ahụ nwere mbudo ibo nke akụkụ anọ ya ha otu nʼọtụtụ. Nke dị nʼihu Ebe ahụ Kachasị Nsọ, yiri ndị ọzọ.
Ezekiel 41:21 in English
Ezekiel 41:21 · Berean Standard Bible
The outer sanctuary had a rectangular doorframe, and the doorframe of the sanctuary was similar.
Context
19otu akụkụ cherub nke bụ ihu mmadụ chere ihu nʼotu nkwụ. Ihu ya nke ọzọ, nke bụ ihu ọdụm, chere ihu na nkwụ nke dị akụkụ nke ọzọ. A tụrụ ha gburugburu ụlọnsọ ukwu ahụ. 20Site nʼala ụlọ ruo nʼelu ọnụ ụzọ ya, a tụrụ oyiyi cherubim na osisi nkwụ nʼahụ aja ụlọ ezumezu ahụ. 21Ọnụ ụlọ ezumezu ahụ nwere mbudo ibo nke akụkụ anọ ya ha otu nʼọtụtụ. Nke dị nʼihu Ebe ahụ Kachasị Nsọ, yiri ndị ọzọ. 22Ebe ịchụ aja ya bụ nke eji osisi wuo. Akụkụ niile nke ebe ịchụ aja a ha nʼotu. Ọ dị otu mita na ọkara nʼogologo, dịrịkwa iri sentimita itoolu nʼakụkụ ya ọbụla. Osisi ka e ji wuo nkuku anọ ya, akụkụ ya niile, na ntọala ya. Mgbe ahụ, nwoke ahụ gwara m, “Nke a bụ tebul na-adị nʼihu Onyenwe anyị.” 23Ma ụlọ ezumezu, ma Ebe ahụ Kachasị Nsọ, nwere ọnụ ụzọ abụọ, nʼotu nʼotu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.