Native Bible

Ezekiel 41:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Obosara ọnụ ụzọ mbata ya dị mita ise na ụma atọ. Akụkụ aja abụọ nke ọnụ ụzọ ahụ dịkwa mita abụọ na ụma asaa. Ọ tụkwara ogologo ụlọ ezumezu ahụ; ya dịrị iri mita abụọ na otu nʼogologo, obosara ya dị mita iri na otu.

Ezekiel 41:2 in English

Ezekiel 41:2 · Berean Standard Bible

The width of the entrance was ten cubits,* and the sides of the entrance were five cubits * on each side. He also measured the length of the outer sanctuary to be forty cubits, and the width to be twenty cubits.*

Context

1Mgbe ahụ, nwoke ahụ kpọbatara m nʼọnụ ụlọ ezumezu ahụ, ọ tụrụ akụkụ ọnụ ụzọ ya. Akụkụ ya ọbụla dị mita atọ na ụma abụọ, nke a bụ obosara ụlọ ikwu ahụ. 2Obosara ọnụ ụzọ mbata ya dị mita ise na ụma atọ. Akụkụ aja abụọ nke ọnụ ụzọ ahụ dịkwa mita abụọ na ụma asaa. Ọ tụkwara ogologo ụlọ ezumezu ahụ; ya dịrị iri mita abụọ na otu nʼogologo, obosara ya dị mita iri na otu. 3Mgbe ahụ, ọ banyere nʼime ime ebe nsọ ahụ, tụọ ogidi dị nʼọnụ ụzọ e si abanye nʼime ya, chọpụta na obosara nke ọbụla bụ otu mita na otu ụma, obosara ọnụ ụzọ ahụ nʼonwe ya dị mita atọ na ụma abụọ. Akụkụ aja nke ọnụ ụzọ ọbụla dị mita atọ na ụma asaa nʼobosara. 4Ọ tụrụ ogologo ime ebe nsọ ahụ, ya dị mita iri na ọkara, obosara ya dịkwa mita iri na ọkara, nʼogologo ụlọ ezumezu ahụ. Ma ọ sịrị m, “Ebe a bụ Ebe Kachasị Nsọ.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.