Izikiel 41:11
Ezekiel 41:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
E nwere ọnụ ụzọ ndị a na-esi abanye nʼọnụụlọ nta ndị ahụ, site nʼala ahụ na-enweghị ihe arụrụ na ya, otu ọnụ ụzọ nʼakụkụ ugwu, nke ọzọ nʼakụkụ ndịda. Obosara ala nke fọdụrụ dị mita abụọ na ụma atọ nʼakụkụ niile gbaa gburugburu.
Ezekiel 41:11 in English
Ezekiel 41:11 · Berean Standard Bible
The side rooms opened into this area, with one entrance on the north and another on the south. The open area was five cubits wide all around.
Context
9Ịdị arọ nke mgbidi ọnụụlọ nta ndị a nʼakụkụ ezi bụ mita abụọ na ụma atọ. Ala tọgbọrọ nʼefu nʼetiti ọnụụlọ nta ụlọnsọ ukwu ahụ, 10na ọnụụlọ ndị nchụaja dị mita iri na ọkara nʼobosara, gbaa gburugburu ụlọnsọ ukwu ahụ. 11E nwere ọnụ ụzọ ndị a na-esi abanye nʼọnụụlọ nta ndị ahụ, site nʼala ahụ na-enweghị ihe arụrụ na ya, otu ọnụ ụzọ nʼakụkụ ugwu, nke ọzọ nʼakụkụ ndịda. Obosara ala nke fọdụrụ dị mita abụọ na ụma atọ nʼakụkụ niile gbaa gburugburu. 12Ma ụlọ nke na-eche ihu nʼogige ụlọnsọ ukwu ahụ, nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, dị iri mita atọ na asaa nʼobosara, ịdị igbidi nke aja ụlọ ahụ dị mita abụọ na ụma atọ, gbaa gburugburu, ogologo ya dịkwa iri mita anọ na asatọ. 13Mgbe ahụ, ọ tụrụ ụlọnsọ ukwu ahụ, ya dịrị iri mita ise na atọ, ogige ụlọnsọ, na ụlọ ahụ nakwa mgbidi ya, dịkwa iri mita ise na atọ nʼogologo.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.