Izikiel 40:7
Ezekiel 40:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Oghere dị nʼụlọ ahụ nke bụ ebe ndị nche na-anọ dị mita atọ nʼọkara nʼobosara. Mgbidi dị nʼetiti ha dị mita abụọ na ụma asaa nʼigbidi. Ebe e si abata na mpụta ọnụ ụzọ ama nke chere ụlọnsọ ukwu ahụ ihu, dị mita atọ nʼọkara nʼomimi.
Ezekiel 40:7 in English
Ezekiel 40:7 · Berean Standard Bible
Each gate chamber was one rod long and one rod wide, and there were five cubits * between the gate chambers. The inner threshold of the gate by the portico facing inward was one rod deep.
Context
5Mgbe ahụ, ahụrụ m mgbidi gbara ụlọnsọ ahụ gburugburu. Ịdị ogologo nke osisi ihe ọtụtụ nke dị nʼaka nwoke ahụ, ruru mita atọ na ụma abụọ, nke ọbụla nʼime ha ruru iri sentimita ise na atọ.* Ọ tụrụ mgbidi ahụ, chọpụta na ịla elu ya dị mita atọ na ọkara. Ịsa mbara ya dịkwa mita atọ na ọkara. 6Emesịa, ọ gara nʼọnụ ụzọ ahụ chere ihu nʼọwụwa anyanwụ, rigoro nʼihe nrigo elu, tụọ ala ala ụzọ mbata nke ọnụ ụzọ ahụ. Obosara ya dị mita atọ na ọkara. 7Oghere dị nʼụlọ ahụ nke bụ ebe ndị nche na-anọ dị mita atọ nʼọkara nʼobosara. Mgbidi dị nʼetiti ha dị mita abụọ na ụma asaa nʼigbidi. Ebe e si abata na mpụta ọnụ ụzọ ama nke chere ụlọnsọ ukwu ahụ ihu, dị mita atọ nʼọkara nʼomimi. 8O jikwa ihe ọtụtụ tụọ ebe mpụta ọnụ ụlọ nke ọnụ ụzọ ama, 9ọ dị mita anọ na ụma abụọ nʼomimi. Ogidi dị nʼakụkụ ya dị otu mita nʼigbidi. Ebe mpụta ọnụ ụlọ nke ụzọ ama ya chere ihu nʼụlọnsọ ukwu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.