Izikiel 40:31
Ezekiel 40:31 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mpụta ọnụ ụlọ ya chere ihu nʼogige dị nʼezi, oyiyi osisi nkwụ ka eji chọọ ogidi ọnụ ụlọ ahụ mma, ihe nrigo nwere nzọ ụkwụ asatọ ka eji arịgo ya.
Ezekiel 40:31 in English
Ezekiel 40:31 · Berean Standard Bible
Its portico faced the outer court, and its side pillars were decorated with palm trees. Eight steps led up to it.
Context
29Nʼọnụ ụlọ ya niile, nʼakụkụ aja ya niile, na mpụta ọnụ ụlọ ya bụkwa otu ọtụtụ dịka ndị ọzọ niile. Ọnụ ụzọ ama ya na mpụta ọnụ ụlọ ya nwere oghere gbaa gburugburu. Ịdị ogologo ya dị iri mita abụọ na asaa, ebe obosara ya dị mita iri na atọ. 30Mpụta ọnụ ụlọ nke ndị dị gburugburu ogige nke ime, dị iri mita na atọ nʼobosara, na mita abụọ na ụma atọ nʼịdị omimi. 31Mpụta ọnụ ụlọ ya chere ihu nʼogige dị nʼezi, oyiyi osisi nkwụ ka eji chọọ ogidi ọnụ ụlọ ahụ mma, ihe nrigo nwere nzọ ụkwụ asatọ ka eji arịgo ya. 32Ọ kpọbatakwara m nʼogige dị nʼime site nʼọnụ ụzọ mbata nke ọwụwa anyanwụ. Ọ tụkwara ọnụ ụzọ ama ahụ, chọpụta na ya na ndị ọzọ bụkwa otu ọtụtụ. 33Nʼọnụ ụlọ ya niile, nʼakụkụ aja ya niile, na mpụta ọnụ ụlọ ya niile bụkwa otu ọtụtụ dịka ndị ọzọ niile. Ọnụ ụzọ ama ya na mpụta ọnụ ụlọ ya nwere oghere gbaa gburugburu. Ịdị ogologo ya dị iri mita abụọ na asaa, ebe obosara ya dị mita iri na atọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.