Native Bible

Ezekiel 40:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ogige nke dị nʼime, nwekwara ọnụ ụzọ ama nke na-echere ihu na ndịda. Ọ tụrụ site nʼotu ọnụ ụzọ ama ruo na nke chere ya ihu, ọ dị iri mita ise na anọ.

Ezekiel 40:27 in English

Ezekiel 40:27 · Berean Standard Bible

The inner court also had a gate facing south, and he measured the distance from gateway to gateway toward the south to be a hundred cubits.

Context

25Ọnụ ụzọ ama ya na mpụta ọnụ ụlọ ya nwere oghereikuku dị warawara gbaa gburugburu, dịka e nwere na ndị ọzọ niile. Ịdị ogologo ya dị iri mita abụọ na asaa, ebe obosara ya dị mita iri na atọ 26Ihe nrigo nwere nzọ ụkwụ asaa dịkwa iji rigoo ya, mpụta ọnụ ụlọ ya dịkwa na ncherita ihu ha, o nwekwara ihe ịchọ mma osisi nkwụ e sere nʼahụ akụkụ aja ahụ, otu nʼotu akụkụ, nke ọzọ nʼakụkụ nke ọzọ. 27Ogige nke dị nʼime, nwekwara ọnụ ụzọ ama nke na-echere ihu na ndịda. Ọ tụrụ site nʼotu ọnụ ụzọ ama ruo na nke chere ya ihu, ọ dị iri mita ise na anọ. 28O duuru m site nʼọnụ ụzọ dị na ndịda banye nʼogige dị nʼime. Ọ tụrụ ọnụ ụzọ mbata a hụ na ya na ọnụ ụzọ nke dị ọzọ bụ otu ọtụtụ. 29Nʼọnụ ụlọ ya niile, nʼakụkụ aja ya niile, na mpụta ọnụ ụlọ ya bụkwa otu ọtụtụ dịka ndị ọzọ niile. Ọnụ ụzọ ama ya na mpụta ọnụ ụlọ ya nwere oghere gbaa gburugburu. Ịdị ogologo ya dị iri mita abụọ na asaa, ebe obosara ya dị mita iri na atọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.