Izikiel 40:24
Ezekiel 40:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, o duuru m gaa nʼakụkụ ndịda, a hụrụ m ọnụ ụzọ mbata ndịda. Ọ tụrụ tụọ akụkụ ogidi ọnụ ụzọ ahụ na mpụta ọnụ ụlọ ya, chọpụta na ya na ndị ọzọ bụ otu ọtụtụ.
Ezekiel 40:24 in English
Ezekiel 40:24 · Berean Standard Bible
Then he led me to the south side, and I saw a gateway facing south. He measured its side pillars and portico, and they had the same measurements as the others.
Context
22Oghereikuku ya, mpụta ọnụ ụzọ ya na osisi nkwụ e sere nʼahụ aja ụlọ ahụ niile, dịka e mere nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama nke na-eche ihu nʼọwụwa anyanwụ, bụ otu ọtụtụ. Ihe nrigo nwere nzọ ụkwụ asaa dị nke e si aga na mpụta ọnụ ụlọ ahụ na ncherita ihu ogige ezi. 23Otu ọnụ ụzọ dị nke gara nʼogige dị nʼime, nke chere ihu ọnụ ụzọ mbata dị nʼugwu, dịka ọ dịkwa nʼakụkụ nke ọwụwa anyanwụ. Ọ tụrụ site nʼotu ọnụ ụzọ ama ruo na nke chere ya ihu, ọ dị iri mita ise na anọ. 24Mgbe ahụ, o duuru m gaa nʼakụkụ ndịda, a hụrụ m ọnụ ụzọ mbata ndịda. Ọ tụrụ tụọ akụkụ ogidi ọnụ ụzọ ahụ na mpụta ọnụ ụlọ ya, chọpụta na ya na ndị ọzọ bụ otu ọtụtụ. 25Ọnụ ụzọ ama ya na mpụta ọnụ ụlọ ya nwere oghereikuku dị warawara gbaa gburugburu, dịka e nwere na ndị ọzọ niile. Ịdị ogologo ya dị iri mita abụọ na asaa, ebe obosara ya dị mita iri na atọ 26Ihe nrigo nwere nzọ ụkwụ asaa dịkwa iji rigoo ya, mpụta ọnụ ụlọ ya dịkwa na ncherita ihu ha, o nwekwara ihe ịchọ mma osisi nkwụ e sere nʼahụ akụkụ aja ahụ, otu nʼotu akụkụ, nke ọzọ nʼakụkụ nke ọzọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.