Native Bible

Ezekiel 40:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ime ụlọ ya dị ọnụ ụlọ atọ nʼakụkụ ya ọbụla. Akụkụ aja na mpụta ọnụ ụlọ ya, bụ otu ọtụtụ dịka ọtụtụ nke ọnụ ụzọ ama mbụ. Ịdị ogologo ya dị iri mita abụọ na asaa, ebe obosara ya dị mita iri na atọ.

Ezekiel 40:21 in English

Ezekiel 40:21 · Berean Standard Bible

Its three gate chambers on each side, its side pillars, and its portico all had the same measurements as the first gate: fifty cubits long and twenty-five cubits wide.

Context

19Mgbe ahụ, ọ tụrụ ịdị ogologo ya, site nʼime ọnụ ụzọ ama nke dịkarịrị ala ruo nʼọnụ ụzọ nke ime ogige, o ruru iri mita ise na atọ nʼakụkụ ihu anyanwụ nakwa nʼakụkụ ugwu. 20Ọ tụrụ ogologo na obosara ọnụ ụzọ nke dị nʼugwu, nke e si abanye nʼogige dị nʼezi. 21Ime ụlọ ya dị ọnụ ụlọ atọ nʼakụkụ ya ọbụla. Akụkụ aja na mpụta ọnụ ụlọ ya, bụ otu ọtụtụ dịka ọtụtụ nke ọnụ ụzọ ama mbụ. Ịdị ogologo ya dị iri mita abụọ na asaa, ebe obosara ya dị mita iri na atọ. 22Oghereikuku ya, mpụta ọnụ ụzọ ya na osisi nkwụ e sere nʼahụ aja ụlọ ahụ niile, dịka e mere nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama nke na-eche ihu nʼọwụwa anyanwụ, bụ otu ọtụtụ. Ihe nrigo nwere nzọ ụkwụ asaa dị nke e si aga na mpụta ọnụ ụlọ ahụ na ncherita ihu ogige ezi. 23Otu ọnụ ụzọ dị nke gara nʼogige dị nʼime, nke chere ihu ọnụ ụzọ mbata dị nʼugwu, dịka ọ dịkwa nʼakụkụ nke ọwụwa anyanwụ. Ọ tụrụ site nʼotu ọnụ ụzọ ama ruo na nke chere ya ihu, ọ dị iri mita ise na anọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.