Native Bible

Ezekiel 39:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Nʼihi ya, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Aga m eme ka Jekọb a dọtara nʼagha lọta. Aga m enwekwa obi ebere nʼahụ ndị Izrel niile. Aga m esitekwa nʼekworo mee ka aha m dịgide nsọ.

Ezekiel 39:25 in English

Ezekiel 39:25 · Berean Standard Bible

Therefore this is what the Lord GOD says: Now I will restore Jacob from captivity * and will have compassion on the whole house of Israel, and I will be jealous for My holy name.

Context

23Mba niile ga-amatakwa na ọ bụ nʼihi mmehie ka e ji dọta Izrel nʼagha, buru ha jee mba dị iche iche. Ha ga-amata na ihe dị otu a dakwasịrị ha nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi ha. Ọ bụ nʼihi ya ka m ji zoo ihu m site nʼebe ha nọ, were ha nyefee nʼaka ndị iro ha. Ha niile dakwara site na mma agha. 24Atara m ha ahụhụ dịka adịghị ọcha ha na ajọ omume ha si dị. Ezokwara m ihu m site nʼebe ha nọ. 25“Nʼihi ya, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Aga m eme ka Jekọb a dọtara nʼagha lọta. Aga m enwekwa obi ebere nʼahụ ndị Izrel niile. Aga m esitekwa nʼekworo mee ka aha m dịgide nsọ. 26Ha ga-echezọkwa ihe ihere ha, na-ekwesighị ntụkwasị obi ha niile, nke ha gosiri m, mgbe ha biri nʼudo nʼala ha, na-enweghị onye na-eme ka ha tụọ egwu. 27Mgbe m mere ka ha site na mba dị iche iche pụta, mgbe m sitere nʼala niile nke ndị iro ha kpọpụta ha, aga m esite na ha gosi ịdị nsọ m nye mba dị iche iche.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.