Native Bible

Ezekiel 39:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Site nʼụbọchị ahụ gaa nʼihu, ụlọ Izrel ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke ha.

Ezekiel 39:22 in English

Ezekiel 39:22 · Berean Standard Bible

From that day forward the house of Israel will know that I am the LORD their God.

Context

20Afọ anụ ịnyịnya, na ụgbọala, na nke ndị dike, na nke ndị agha niile ga-eju unu na tebul m.’ Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya. 21“Mgbe ahụ, aga m egosi ebube m na nsọpụrụ m nʼetiti mba niile dị iche iche. Mba niile ga-ahụkwa ahụhụ nke m tara ha, na aka m nke m tụkwasịrị ha. 22Site nʼụbọchị ahụ gaa nʼihu, ụlọ Izrel ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke ha. 23Mba niile ga-amatakwa na ọ bụ nʼihi mmehie ka e ji dọta Izrel nʼagha, buru ha jee mba dị iche iche. Ha ga-amata na ihe dị otu a dakwasịrị ha nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi ha. Ọ bụ nʼihi ya ka m ji zoo ihu m site nʼebe ha nọ, were ha nyefee nʼaka ndị iro ha. Ha niile dakwara site na mma agha. 24Atara m ha ahụhụ dịka adịghị ọcha ha na ajọ omume ha si dị. Ezokwara m ihu m site nʼebe ha nọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.