Izikiel 38:16
Ezekiel 38:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Unu ga-abịa ibuso ndị m Izrel agha, kpuchie ala ha dịka igwe ojii. Nʼụbọchị ndị ahụ dị nʼihu, aga m eme ka gị, bụ Gog, bịa buso ala m agha, ka mba niile si otu a mata m, mgbe m mere ka ịdị nsọ m pụta ìhè nʼanya ha site nʼihe m ga-eme.’
Ezekiel 38:16 in English
Ezekiel 38:16 · Berean Standard Bible
You will advance against My people Israel like a cloud covering the land. It will happen in the latter days, O Gog, that I will bring you against My land, so that the nations may know Me when I show Myself holy in you before their eyes.
Context
14“Nʼihi ya, nwa nke mmadụ, buo amụma sị Gog, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Nʼụbọchị ahụ mgbe ndị m bụ Izrel na-ebi nʼudo nʼala ha, ọ bụ na ị gaghị ahụta ya? 15Ị ga-esi nʼebe obibi gị dị nʼugwu bịa, gị na ọtụtụ mba dị iche iche, ndị na-anọkwasị nʼịnyịnya. Ha ga-adị ukwuu, bụrụ ndị agha dị ike. 16Unu ga-abịa ibuso ndị m Izrel agha, kpuchie ala ha dịka igwe ojii. Nʼụbọchị ndị ahụ dị nʼihu, aga m eme ka gị, bụ Gog, bịa buso ala m agha, ka mba niile si otu a mata m, mgbe m mere ka ịdị nsọ m pụta ìhè nʼanya ha site nʼihe m ga-eme.’ 17“ ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ọ bụ gị, bụ onye ahụ m kwuru okwu banyere ya nʼoge gara aga, site nʼọnụ ndị ohu m, bụ ndị amụma Izrel, ndị buru amụma ọtụtụ afọ na mgbe ahụ, sị, na m ga-eme ka ị megide ndị m. 18Lee ihe ga-eme nʼụbọchị ahụ. Mgbe Gog busoro ala Izrel agha, ọ ga-esi otu a kpalie iwe m dị ọkụ. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.