Native Bible

Ezekiel 38:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị Sheba na Dedan, na ndị ahịa Tashish niile, na ụmụ ọdụm ya niile ga-ajụ gị, “Ị bịara ịkwata ihe nkwata? Ị chịkọtara usuu ndị agha gị nʼihi ịkwara ihe nlụta, na iburu ọlaọcha na ọlaedo, na ịchịrị igwe anụ ụlọ ha, na ngwongwo ha, na ịkwakọrọ ihe ha nwere nʼike?” ’

Ezekiel 38:13 in English

Ezekiel 38:13 · Berean Standard Bible

Sheba and Dedan and the merchants of Tarshish with all its villages * will ask, ‘Have you come to capture the plunder? Have you assembled your hordes to carry away loot, to make off with silver and gold, to take cattle and goods, to seize great spoil?’

Context

11Ị ga-asị, “Aga m ebuli megide nʼala na-enweghị mgbidi, aga m awakpo ndị nọ nʼudo na-adịghị atụ anya nsogbu ọbụla, ha niile bụ ndị bi nʼebe na-enweghị mgbidi, ha enweghịkwa ibo ọnụ ụzọ na mkpọrọ e ji akpọchi ha. 12Aga m akwata ihe nkwata, lụtakwa ihe nlụta nʼagha. Aga m eweli aka m megide obodo ndị a niile e wugharịrị ewugharị, megidekwa ndị a niile e si na mba dị iche iche chịkọtaa, bụ ndị bara ọgaranya nʼanụ ụlọ na ngwongwo dị iche iche, ndị bikwa nʼetiti ala a.” 13Ndị Sheba na Dedan, na ndị ahịa Tashish niile, na ụmụ ọdụm ya niile ga-ajụ gị, “Ị bịara ịkwata ihe nkwata? Ị chịkọtara usuu ndị agha gị nʼihi ịkwara ihe nlụta, na iburu ọlaọcha na ọlaedo, na ịchịrị igwe anụ ụlọ ha, na ngwongwo ha, na ịkwakọrọ ihe ha nwere nʼike?” ’ 14“Nʼihi ya, nwa nke mmadụ, buo amụma sị Gog, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Nʼụbọchị ahụ mgbe ndị m bụ Izrel na-ebi nʼudo nʼala ha, ọ bụ na ị gaghị ahụta ya? 15Ị ga-esi nʼebe obibi gị dị nʼugwu bịa, gị na ọtụtụ mba dị iche iche, ndị na-anọkwasị nʼịnyịnya. Ha ga-adị ukwuu, bụrụ ndị agha dị ike.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.