Native Bible

Ezekiel 37:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha ga-ebi nʼala ahụ m nyere ohu m Jekọb, ala ebe nna nna ha biri. Ha na ụmụ ha ga-ebi nʼime ya. Ụmụ ụmụ ha ruo ọgbọ niile ga-ebikwa nʼime ya. Ohu m Devid ga-abụ eze ha ruo ebighị ebi.

Ezekiel 37:25 in English

Ezekiel 37:25 · Berean Standard Bible

They will live in the land that I gave to My servant Jacob, where your fathers lived. They will live there forever with their children and grandchildren, and My servant David will be their prince forever.

Context

23Ha agaghị ejikwa arụsị ha niile, maọbụ ihe a pịrị apị rụrụ arụ, maọbụ jiri ihe ọjọọ ndị ọzọ dị iche iche merụọ onwe ha ọzọ. Nʼihi na aga m azọpụta ha site na ịlaghachi azụ nʼụzọ mmehie ha niile, meekwa ka ha dị ọcha. Ha ga-abụ ndị m, mụ onwe m ga-abụkwa Chineke ha. 24“ ‘Ohu m, Devid, ga-abụ eze ga-achị ha, ha ga-enwekwa otu onye ọzụzụ atụrụ. Ha ga-edebezu iwu m niile, na ụkpụrụ m niile. 25Ha ga-ebi nʼala ahụ m nyere ohu m Jekọb, ala ebe nna nna ha biri. Ha na ụmụ ha ga-ebi nʼime ya. Ụmụ ụmụ ha ruo ọgbọ niile ga-ebikwa nʼime ya. Ohu m Devid ga-abụ eze ha ruo ebighị ebi. 26Mụ na ha ga-agba ndụ udo, ọgbụgba ndụ nke ga-adị ruo mgbe ebighị ebi. Aga m agọzi ha, mee ka ha baa ụba. Nʼetiti ha kwa ka ụlọnsọ m ga-adị ruo mgbe ebighị ebi. 27Ebe obibi m ga-abụkwa nʼetiti ha. E, aga m abụ Chineke ha, ha ga-abụkwa ndị m.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.