Izikiel 37:20
Ezekiel 37:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Were mkpirisi osisi ndị ahụ i dere ihe nke dị nʼaka gị, gosi ha,
Ezekiel 37:20 in English
Ezekiel 37:20 · Berean Standard Bible
When the sticks on which you write are in your hand and in full view of the people,
Context
18“Mgbe ndị gị jụrụ gị, ‘Ị gaghị egosi anyị ihe nke a pụtara?’ 19gwa ha, sị, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu: Lee, agaje m iwere osisi Josef, nke dị Ifrem nʼaka, nke bụkwa ihe nọchiri anya ebo ụfọdụ ndị Izrel, jidekọtaa ya na osisi nọchiri anya Juda, mee ha ka ha ghọọ otu osisi, bụrụkwa otu nʼaka m.’ 20Were mkpirisi osisi ndị ahụ i dere ihe nke dị nʼaka gị, gosi ha, 21ma gwakwa ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu: Aga m esite na mba niile ndị Izrel jere biri kpọpụta ha. Aga m achịkọtakwa ha site nʼakụkụ niile, kpọbata ha nʼala nke aka ha. 22Aga m eme ha ka ha bụrụ otu mba nʼala ahụ, nʼugwu niile nke Izrel. Ha ga-enwe naanị otu eze nke ga-achị ha niile. Ha agaghị abụkwa mba abụọ maọbụ alaeze abụọ ọzọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.