Native Bible

Ezekiel 36:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“ ‘Ma unu, ugwu niile nke Izrel ga-awapụta ngalaba, mịakwa mkpụrụ nke ndị m ga-eri, nʼihi na oge ha ga-alọghachi adịghịkwa anya.

Ezekiel 36:8 in English

Ezekiel 36:8 · Berean Standard Bible

But you, O mountains of Israel, will produce branches and bear fruit for My people Israel, for they will soon come home.

Context

6Nʼihi nke a, buo amụma banyere Izrel, gwa ugwu ukwu ya na ugwu nta ya niile, na mgbawara ala ya, na ndagwurugwu ya niile, sị, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, ọ bụ site nʼọnụma nke ekworo ka m ji ekwu okwu ndị a, nʼihi na unu ahụọla ahụhụ site na nlelị ndị mba ọzọ na-elelị unu. 7Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, eweliri m aka m elu ṅụọ iyi na mba ndị a gbara unu gburugburu ga-anọkwa nʼọnọdụ ihere. 8“ ‘Ma unu, ugwu niile nke Izrel ga-awapụta ngalaba, mịakwa mkpụrụ nke ndị m ga-eri, nʼihi na oge ha ga-alọghachi adịghịkwa anya. 9Lee, mụ onwe m dịnyeere unu; aga m abịa inyere unu aka, nʼihi na a ga-akọgharịkwa unu, kụọkwa mkpụrụ nʼime unu. 10Aga m emekwa ka ọnụọgụgụ ndị ga-ebi nʼime unu baa ụba, ọ bụladị ụlọ Izrel niile. Ha ga-ebikwa nʼobodo niile, wugharịakwa ebe niile e tikpọrọ etikpọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.