Native Bible

Ezekiel 36:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Aga m eme ka ịdị nsọ nke aha ukwuu m, nke unu mere ka ọ ghara ịdị nsọ nʼetiti mba niile, pụta ìhè. Mgbe ahụ, mba niile ga-amakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara, mgbe a ga-edo m nsọ site nʼime unu nʼanya ha.

Ezekiel 36:23 in English

Ezekiel 36:23 · Berean Standard Bible

I will show the holiness of My great name, which has been profaned among the nations—the name you have profaned among them. Then the nations will know that I am the LORD, declares the Lord GOD, when I show My holiness in you before their eyes.

Context

21Ihe na-ewutekwa m bụ aha nsọ m, nke ụlọ Izrel mere ka ọ ghara ịdị nsọ nʼetiti mba niile bụ ebe ha gara. 22“Ya mere, gwa ụlọ Izrel, Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ọ bụghị nʼihi na unu, ụlọ Izrel, ka m ji na-eme ihe ndị a, kama ọ bụ nʼihi aha nsọ m, nke unu mere ka ọ ghara ịdị nsọ nʼetiti mba niile dị iche iche ebe ndị unu gara. 23Aga m eme ka ịdị nsọ nke aha ukwuu m, nke unu mere ka ọ ghara ịdị nsọ nʼetiti mba niile, pụta ìhè. Mgbe ahụ, mba niile ga-amakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara, mgbe a ga-edo m nsọ site nʼime unu nʼanya ha. 24“ ‘Nʼihi na aga m esi na mba niile dị iche iche kpọpụta unu. Aga m achịkọta unu site nʼala niile, mee ka unu bata nʼala unu. 25Aga m efekwasị unu mmiri dị ọcha, unu ga-adịkwa ọcha. Aga m eme ka unu dị ọcha* site na-adịghị ọcha unu niile, na site nʼikpere arụsị unu niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.