Native Bible

Ezekiel 35:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ugwu ukwu gị niile ga-ejupụta nʼozu ndị nwụrụ anwụ, ugwu nta niile, na ndagwurugwu niile na mgbawara niile dị nʼala ga-ejupụta nʼozu ndị e ji mma agha gbuo.

Ezekiel 35:8 in English

Ezekiel 35:8 · Berean Standard Bible

I will fill its mountains with the slain; those killed by the sword will fall on your hills, in your valleys, and in all your ravines.

Context

6Nʼihi nke a, ebe m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri, aga m enyefe gị nʼaka ndị na-awụsi ọbara. Ọbara ga-achụkwa gị ọsọ. Ebe ọ bụ na ị kpọghị iwusi ọbara asị, ọbara a ga-awụsị nʼime gị ga-achụ gị ọsọ. 7Aga m eme ka ugwu Sia ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu. Aga m esitekwa nʼime ya bipụ ndị na-abata abata, na ndị na-apụ apụ. 8Ugwu ukwu gị niile ga-ejupụta nʼozu ndị nwụrụ anwụ, ugwu nta niile, na ndagwurugwu niile na mgbawara niile dị nʼala ga-ejupụta nʼozu ndị e ji mma agha gbuo. 9Ị gaghị ebulitekwa isi gị ọzọ. Ebe tọgbọrọ nʼefu ka ị ga-abụ ruo ebighị ebi. A gaghị ewuzikwa obodo gị ọzọ. Ị ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị. 10“ ‘Nʼihi na ị sịrị, “Mba abụọ ndị a, na ala abụọ ndị a ga-abụ nke anyị, anyị ga-enweta ha,” nʼagbanyeghị na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị nọ nʼebe ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.