Native Bible

Ezekiel 34:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Osisi ọhịa ga-amị mkpụrụ ya, ala ga-eme ihe omume ya. Ndị m ga-anọkwa nʼudo nʼala ha na-atụghị ụjọ. Ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe m tijasịrị mkpọrọ yoku niile ha, napụta ha site nʼaka ndị na-akpagbu ha.

Ezekiel 34:27 in English

Ezekiel 34:27 · Berean Standard Bible

The trees of the field will give their fruit, and the land will yield its produce; My flock will be secure in their land. Then they will know that I am the LORD, when I have broken the bars of their yoke and delivered them from the hands that enslaved them.

Context

25“ ‘Mụ na ha ga-agba ndụ udo. Aga m achụpụkwa anụ ọjọọ niile nʼala ha, ka ndị m nwee ike ibi nʼudo nʼọzara, ma rahụkwa ụra ọ bụladị nʼetiti oke ọhịa nʼenweghị nsogbu. 26Aga m agọzi ndị m, gọziekwa ebe obibi ha na ihe niile gbara ugwu nta m gburugburu. Aga m ezite mmiri ozuzo nʼoge ya, nʼezie, ngọzị ga-ezoro ha dịka mmiri. 27Osisi ọhịa ga-amị mkpụrụ ya, ala ga-eme ihe omume ya. Ndị m ga-anọkwa nʼudo nʼala ha na-atụghị ụjọ. Ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe m tijasịrị mkpọrọ yoku niile ha, napụta ha site nʼaka ndị na-akpagbu ha. 28Ha agaghị abụkwa mba ndị ọzọ na-apụnara ihe ha nwere, maọbụ ndị anụ ọhịa ga-adọgbu. Ha ga-ebi na-atụghị ụjọ, ọ dịkwaghị onye ga-eme ka ha tụọ egwu. 29Aga m enye ha ala nke amaara nke ọma nʼihi ihe na-epupụta nʼime ya, ha agaghị abụkwa ndị ụnwụ mekpara ahụ nʼala ahụ ọzọ, maọbụ ihe a na-akwa emo nke mba dị iche iche.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.