Native Bible

Ezekiel 34:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“ ‘Nʼihi ya, nke a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị ha, nʼezie, mụ onwe m ga-ekpe ikpe nʼetiti atụrụ ndị gbara abụba, na atụrụ ndị a tara ahụ.

Ezekiel 34:20 in English

Ezekiel 34:20 · Berean Standard Bible

Therefore this is what the Lord GOD says to them: ‘Behold, I Myself will judge between the fat sheep and the lean sheep.

Context

18Ọ bụ unu ihe nta nʼanya na unu na-ata nri kachasị mma? Unu ga-ejikwa ụkwụ zọtọsịa nke fọdụrụ? Ọ bụ unu ihe nta nʼanya na unu na-aṅụ mmiri nke kachasị mma? Unu ga-ejikwa ụkwụ unu na-agbarụ nke fọdụrụ? 19Ọ bụ ihe kwesiri ekwesi na igwe atụrụ m ga-ata nri unu zọtọrọ azọtọ, ma ṅụọkwa mmiri unu gbarụrụ agbarụ? 20“ ‘Nʼihi ya, nke a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị ha, nʼezie, mụ onwe m ga-ekpe ikpe nʼetiti atụrụ ndị gbara abụba, na atụrụ ndị a tara ahụ. 21Nʼihi na unu ji akụkụ ahụ unu, na ubu aka unu na-enupu ha. Unu jikwa mpi unu na-enupu ndị na-adịghị ike, tutu ruo mgbe unu chụsachara ha. 22Lee, aga m azọpụta igwe ewu na atụrụ m. Aga m ekpe ikpe nʼetiti otu atụrụ na ibe ya. Ha agaghị aghọkwa ihe oriri ọzọ. Aga m ekpe ikpe nʼetiti otu atụrụ na ibe ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.