Native Bible

Ezekiel 34:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Dịka onye ọzụzụ atụrụ si elekọta igwe ewu na atụrụ ya anya, mgbe ha na ya nọ, otu a ka m ga-esi lekọta igwe atụrụ m. Aga m anapụta ha site nʼebe niile ha gbasasịrị gaa, nʼụbọchị igwe ojii na ọchịchịrị ahụ.

Ezekiel 34:12 in English

Ezekiel 34:12 · Berean Standard Bible

As a shepherd looks for his scattered sheep when he is among the flock, so I will look for My flock. I will rescue them from all the places to which they were scattered on a day of clouds and darkness.

Context

10Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, Ana m edo onwe m megide ndị ọzụzụ atụrụ niile. Ọ bụkwa nʼaka ha ka m ga-ajụta ihe banyere igwe ewu na atụrụ m. Aga m eme ka ha kwụsị ị bụ ndị na-azụ igwe ewu na atụrụ m, ka ndị ọzụzụ atụrụ ndị a ghara ịzụ onwe ha nri ọzọ. Aga m esite nʼọnụ ha napụta igwe ewu na atụrụ m, ha agaghị abụkwara ha nri ọzọ. 11“ ‘Nʼihi na Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, mụ onwe m ga-eji aka m pụọ gaa chọgharịa igwe atụrụ m. Mụ onwe m kwa ga-elekọta ha. 12Dịka onye ọzụzụ atụrụ si elekọta igwe ewu na atụrụ ya anya, mgbe ha na ya nọ, otu a ka m ga-esi lekọta igwe atụrụ m. Aga m anapụta ha site nʼebe niile ha gbasasịrị gaa, nʼụbọchị igwe ojii na ọchịchịrị ahụ. 13Aga m esite nʼobodo niile, na mba niile ha nọ kpọghachi ha nʼala nke ha. Aga m azụ ha nri nʼelu ugwu niile nke Izrel, na nʼakụkụ mmiri niile, ebe ala na-ewepụta nri nke ọma. 14Aga m azụ ha nʼebe ịta ahịhịa mara mma, na nʼelu ugwu niile nke Izrel. Nʼebe ahụ ka ha ga-amakpukwa nʼudo. Ha ga-ata nri nʼebe ịta ahịhịa mara mma nke elu ugwu Izrel.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.