Izikiel 33:20
Ezekiel 33:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma unu bụ ụlọ Izrel na-asị, ‘Ụzọ Onyenwe anyị ezighị ezi.’ Ma aga m ekpe onye ọbụla nʼime unu ikpe dịka ụzọ ya si dị.”
Ezekiel 33:20 in English
Ezekiel 33:20 · Berean Standard Bible
Yet you say, ‘The way of the Lord is not just.’ But I will judge each of you according to his ways, O house of Israel.”
Context
18Ọ bụrụ na onye ezi omume esite nʼezi omume ya chigharịa malite ime ihe ọjọọ, ọ ga-anwụ maka ya. 19Ma ọ bụrụ na onye ajọ omume esite nʼajọ omume ya chigharịa malite ime ihe ziri ezi na nke dị mma, ọ ga-adị ndụ site nʼime nke a. 20Ma unu bụ ụlọ Izrel na-asị, ‘Ụzọ Onyenwe anyị ezighị ezi.’ Ma aga m ekpe onye ọbụla nʼime unu ikpe dịka ụzọ ya si dị.” 21O ruo nʼafọ nke iri na abụọ nke e mere ka anyị jee biri na mba ọzọ, nʼọnwa nke iri, nʼụbọchị nke ise nke ọnwa ahụ, otu onye nʼime ndị sitere na Jerusalem gbapụ bịakwutere m gwa m sị, “Obodo ahụ adaala.” 22Ma nʼanyasị, tupu onye ahụ gbapụrụ agbapụ abịa, aka Onyenwe anyị ruru m ahụ, mee ka m nweekwa ike ikwu okwu ọzọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.