Native Bible

Ezekiel 31:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha onwe ha kwa, dịka sida ukwuu ahụ, sokwaara gbadaruo nʼala mmụọ, gakwuru ndị niile eji mma agha gbuo, ha na ndị ikom ji mma agha bụ ndị biri nʼokpuru ndo ya nʼetiti mba dị iche iche.

Ezekiel 31:17 in English

Ezekiel 31:17 · Berean Standard Bible

They too descended with it to Sheol, to those slain by the sword. As its allies they had lived in its shade among the nations.

Context

15“ ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Nʼụbọchị ahụ e mere ka ọ rịdaruo nʼala mmụọ, a kwụsịrị m ogbu mmiri niile were ha kpuchie ya. A kwụsịrị nsọgharị nke mmiri, meekwa ka ịba ụba nke mmiri ya niile kwụsị. Nʼihi ya, eyinyere m Lebanọn uwe mkpe, osisi niile nke ọhịa kpọnwụkwara nʼihi ya. 16Emere m ka mba niile maa jijiji nʼegwu nʼihi ọdịda ya, mgbe m tụnyere ya na ndị ahụ na-aga nʼolulu nʼime ala mmụọ. Mgbe ahụ, a kasịrị osisi niile mara mma obi, bụ osisi ndị ahụ dị nʼogige Iden, na osisi ọma niile nke Lebanọn, ndị nke mgbọrọgwụ ha na-enweta mmiri nke ọma. 17Ha onwe ha kwa, dịka sida ukwuu ahụ, sokwaara gbadaruo nʼala mmụọ, gakwuru ndị niile eji mma agha gbuo, ha na ndị ikom ji mma agha bụ ndị biri nʼokpuru ndo ya nʼetiti mba dị iche iche. 18“ ‘Olee osisi dị nʼIden a ga-eji tụnyere gị nʼịma mma, na nʼịdị ebube? Ma gị onwe gị kwa, na osisi ndị a niile dị nʼIden ka a ga-eme ka unu rịdaruo nʼokpuru ụwa. Ị ga-edina nʼetiti ndị a na-ebighị ugwu, gị na ndị eji mma agha gbuo. “ ‘Nke a bụ Fero na usuu ndị agha ya niile, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.’ ” 31:10 Ya bụ, sida ukwu ahụ

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.