Izikiel 27:18
Ezekiel 27:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“ ‘Damaskọs bụkwa ndị ahịa gị, nʼihi ọtụtụ ngwa ahịa na ụba ihe ndị ị nwere ire ere. Ọ bụkwa mmanya si Helbon, na ajị anụ dị ọcha nke esi Zaha weta,
Ezekiel 27:18 in English
Ezekiel 27:18 · Berean Standard Bible
Because of your many products and your great wealth of goods, Damascus traded with you wine from Helbon, wool from Zahar,
Context
16“ ‘Ndị Aram ka gị na ha zụrụ ahịa nʼihi ọtụtụ ngwa ahịa gị. Ha na-ejikwa nkume dị oke ọnụ tọkwọisi na akwa e sijiri esiji odo odo, na akwa a kpara nke ọma, na ezi akwa ọcha, na koral, na nkume oke ọnụahịa rubi na-akwụ gị ụgwọ ihe ha zụrụ gị. 17“ ‘Ndị Juda na ndị Izrel niile bụkwa ndị ahịa gị. Ha na-eji ọka wiiti nke si nʼobodo Minit, ya na shuga, na mmanụ aṅụ, na mmanụ, na mmanụ otite na-akwụ gị ụgwọ ihe ha zụrụ gị. 18“ ‘Damaskọs bụkwa ndị ahịa gị, nʼihi ọtụtụ ngwa ahịa na ụba ihe ndị ị nwere ire ere. Ọ bụkwa mmanya si Helbon, na ajị anụ dị ọcha nke esi Zaha weta, 19na mmanya a gbara nʼudu nʼudu nke si Ụzal, na igwe nwupụrụ enwupụ, na kashia, na kalamus, ka ha ji akwụ gị ụgwọ ihe ha zụrụ gị. 20“ ‘Dedan bụ onye ahịa gị nʼakwa a na-agbasa nʼelu ịnyịnya anọkwasị ọdụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.