Izikiel 26:7
Ezekiel 26:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Nʼihi na otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Aga m esite na mgbago ugwu kpọta Nebukadneza eze Babilọn, onye bụ eze ndị eze, ọ ga-achị ọtụtụ ndị agha na ụgbọala, na ndị na-agba ịnyịnya bilie imegide Taịa.
Ezekiel 26:7 in English
Ezekiel 26:7 · Berean Standard Bible
For this is what the Lord GOD says: ‘Behold, I will bring against Tyre from the north Nebuchadnezzar * king of Babylon, king of kings, with horses and chariots, with cavalry and a great company of troops.
Context
5Ọ ga-aghọkwa ebe ndị ọkụ azụ na-agbasa ụgbụ ha nʼetiti oke osimiri. Nʼihi na mụ onwe m ekwuola ya. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara. Ọ ga-aghọkwara mba niile dị iche iche ihe a kwatara nʼagha. 6Ma a ga-eji mma agha laa ụmụada ya bi nʼelu ala nʼiyi. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.” 7“Nʼihi na otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Aga m esite na mgbago ugwu kpọta Nebukadneza eze Babilọn, onye bụ eze ndị eze, ọ ga-achị ọtụtụ ndị agha na ụgbọala, na ndị na-agba ịnyịnya bilie imegide Taịa. 8Ọ ga-ebu ụzọ jiri mma agha bibie ndị gị bi nʼelu ala. Ọ ga-agbakwa obodo gị gburugburu, wulie mgbidi agha ya elu, imegide mgbidi obodo gị. Ọ ga-ewelikwa ọta agha ya elu. 9Ọ ga-echezikwa ihe agha e ji akwatu mgbidi nʼebe mgbidi gị dị, jiri ngwa agha ya kwada ụlọ elu gị niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.