Native Bible

Ezekiel 25:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ya mere, ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, ana m aga isetipụ aka m megide ndị Filistia. Aga m ebipụ ndị Keret, bibie ndị ahụ niile bi nʼọnụ mmiri osimiri.

Ezekiel 25:16 in English

Ezekiel 25:16 · Berean Standard Bible

therefore this is what the Lord GOD says: Behold, I will stretch out My hand against the Philistines, and I will cut off the Cherethites and destroy the remnant along the coast.

Context

14Ọ bụ site nʼaka ndị nke m Izrel ka m ga-esi bọọ ọbọ megide Edọm, ha ga-emeso ndị Edọm dịka ịba ụba nke iwe m na ọnụma m si dị, ha ga-amata ihe ịbọ ọbọ bụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.’ ” 15“Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: ‘Nʼihi na ndị Filistia esitela na mmụọ nke ịbọ ọbọ, na mmụọ ịkpọ asị nke dị ha nʼobi bọọrọ onwe ha ọbọ, chọọ ịla ha nʼiyi. 16Ya mere, ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, ana m aga isetipụ aka m megide ndị Filistia. Aga m ebipụ ndị Keret, bibie ndị ahụ niile bi nʼọnụ mmiri osimiri. 17Aga m esite nʼoke ọnụma bọọ ha ọbọ site na ịta ha ahụhụ. Mgbe ahụ ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe m ga-abọgwata ha ọbọ.’ ”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.