Izikiel 24:25
Ezekiel 24:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ma gị, nwa nke mmadụ, nʼụbọchị ahụ m napụrụ ha ebe ha siri ike, nke bụ ọṅụ ha na ebube ha, na ihe anya ha na-achọsi ike; na ihe na-atọ obi ha ụtọ, na ụmụ ha ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom,
Ezekiel 24:25 in English
Ezekiel 24:25 · Berean Standard Bible
And you, son of man, know that on the day I take away their stronghold, their pride and joy—the desire of their eyes which uplifted their souls—and their sons and daughters as well,
Context
23Ihe ikechi isi unu ga-adịgide nʼisi unu, akpụkpọụkwụ unu ga-adịkwa nʼụkwụ unu. Unu agaghị akwa akwa maọbụ tie aka nʼobi, kama unu ga-ata ahụ nʼihi mmehie unu, sụkwaa ude nʼetiti onwe unu. 24Izikiel ga-abụrụ unu ihe ịmaatụ. Unu ga-emekwa dịka o mere mgbe ihe ndị a mezuru. Unu ga-amata nʼezie na mụ onwe m bụ Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị.’ 25“Ma gị, nwa nke mmadụ, nʼụbọchị ahụ m napụrụ ha ebe ha siri ike, nke bụ ọṅụ ha na ebube ha, na ihe anya ha na-achọsi ike; na ihe na-atọ obi ha ụtọ, na ụmụ ha ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom, 26nʼụbọchị ahụ, ọ bụ onye na-agba ọsọ ndụ ga-agbakwute gị ịkọrọ gị ihe mere. 27Nʼoge ahụ, ị ga-asaghe ọnụ gị. Gị na onye ahụ na-agba ọsọ ndụ ga-ekwurịta okwu. Ị gaghị anọkwa juu ọzọ. Nʼihi ya, ị ga-aghọrọ ha ihe ịrịbama. Ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.”
24:21 Ga-anwụ site na mma agha
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.