Izikiel 24:21
Ezekiel 24:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gwa ụlọ Izrel, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu: Ana m aga ime ka ebe nsọ m ghara ị dị nsọ, bụ ebe e wusiri ike nke unu ji na-anya isi, ihe na-amasị anya unu, nke ihe banyere ya na-atọ obi unu ụtọ. Ụmụ unu ndị ikom na ndị inyom, ndị unu hapụrụ ga-ada site na mma agha.*
Ezekiel 24:21 in English
Ezekiel 24:21 · Berean Standard Bible
Tell the house of Israel that this is what the Lord GOD says: ‘I am about to desecrate My sanctuary, the pride of your power, the desire of your eyes, and the delight of your soul. And the sons and daughters you left behind will fall by the sword.’
Context
19Mgbe ahụ, ndị mmadụ sịrị m, “Ị gaghị agwa anyị ihe ihe ndị a pụtara? Gịnị mere iji eme omume dị otu a?” 20Ya mere a sịrị m ha, “Okwu nke Onyenwe anyị bịakwutere m, 21Gwa ụlọ Izrel, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu: Ana m aga ime ka ebe nsọ m ghara ị dị nsọ, bụ ebe e wusiri ike nke unu ji na-anya isi, ihe na-amasị anya unu, nke ihe banyere ya na-atọ obi unu ụtọ. Ụmụ unu ndị ikom na ndị inyom, ndị unu hapụrụ ga-ada site na mma agha.* 22Mgbe ahụ, unu ga-eme dịka m mere. Unu agaghị ekpuchi egbugbere ọnụ unu, maọbụ rie nri ndị na-eru ụjụ kwesiri iri. 23Ihe ikechi isi unu ga-adịgide nʼisi unu, akpụkpọụkwụ unu ga-adịkwa nʼụkwụ unu. Unu agaghị akwa akwa maọbụ tie aka nʼobi, kama unu ga-ata ahụ nʼihi mmehie unu, sụkwaa ude nʼetiti onwe unu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.