Native Bible

Ezekiel 24:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

I nwere ike sụọ ude, ma asụsila ya ike. Ị gaghị eru uju nʼihi onye nwụrụ anwụ. Kechie isi gị, yirikwa akpụkpọụkwụ gị, ekpuchila egbugbere ọnụ gị, maọbụ rie nri ndị na-eru ụjụ na-eri.”

Ezekiel 24:17 in English

Ezekiel 24:17 · Berean Standard Bible

Groan quietly; do not mourn for the dead. Put on your turban and strap your sandals on your feet; do not cover your lips or eat the bread of mourners.”

Context

15Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 16“Nwa nke mmadụ, ana m aga iwere ihe otiti napụ gị onye ahụ ihe ya na-atọ gị ụtọ. Ma mgbe o mere, ị gaghị eti aka nʼobi maọbụ kwaa akwa. Anya mmiri agakwaghị esi gị nʼanya pụta. 17I nwere ike sụọ ude, ma asụsila ya ike. Ị gaghị eru uju nʼihi onye nwụrụ anwụ. Kechie isi gị, yirikwa akpụkpọụkwụ gị, ekpuchila egbugbere ọnụ gị, maọbụ rie nri ndị na-eru ụjụ na-eri.” 18Agwara m ndị mmadụ okwu a nʼụtụtụ, ma nʼanyasị nwunye m nwụrụ. Nʼụtụtụ echi ya, emere m ihe niile dịka e siri nye m ya nʼiwu. 19Mgbe ahụ, ndị mmadụ sịrị m, “Ị gaghị agwa anyị ihe ihe ndị a pụtara? Gịnị mere iji eme omume dị otu a?”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.