Native Bible

Ezekiel 23:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

O weere onwe ya nyefee nʼaka ndị ikom Asịrịa ogugo ha kachasị elu dịka onye akwụna, merụọkwa onwe ya site nʼife arụsị dị iche iche nke onye ọbụla agụụ ya gụrụ obi ya.

Ezekiel 23:7 in English

Ezekiel 23:7 · Berean Standard Bible

She offered sexual favors to all the elite of Assyria. She defiled herself with all the idols of those for whom she lusted.

Context

5“Ohola na-agba akwụna mgbe ọ ka bụ nkem. O nwere agụụ ịkwa iko nʼebe ndị niile ọ hụrụ nʼanya nọ, bụ ndị dike nʼagha nke ndị Asịrịa, 6ndị yi uwe anụnụ, ndịisi ọchịchị na ndị ọchịagha, ha niile bụ ụmụ okorobịa mara mma nʼile anya, na ndịisi agha, ndị ikom na-amakwasị nʼelu ịnyịnya. 7O weere onwe ya nyefee nʼaka ndị ikom Asịrịa ogugo ha kachasị elu dịka onye akwụna, merụọkwa onwe ya site nʼife arụsị dị iche iche nke onye ọbụla agụụ ya gụrụ obi ya. 8Ma ọ hapụghị mmụọ akwụna ahụ dị nʼime ya, bụ nke o bidoro nʼIjipt, nke bụ na mgbe ọ bụ agbọghọ ya na ndị ikom dinakọrọ, ha na-apịkwa ọnụ ara agbọghọ ya aka, na-awụkwasịkwa agụụ nke ọchịchọ ọjọọ ha nʼahụ ya. 9“Nʼihi nke a enyefere m ya nʼaka ndị ahụ hụrụ ya nʼanya, bụ ndị Asịrịa, ndị agụụ ha na-agụ ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.