Native Bible

Ezekiel 23:44 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha bara dinakwuru ya. Dịka ndị ikom si abakwuru nwanyị akwụna, otu a ka ha si bakwuru ụmụ nwanyị ndụ ọjọọ a bụ Ohola na Oholiba.

Ezekiel 23:44 in English

Ezekiel 23:44 · Berean Standard Bible

And they slept with her as with a prostitute; they slept with Oholah and Oholibah, those lewd women.

Context

42“Olu igwe mmadụ ndị obi dị ụtọ na-ada gburugburu ya nʼime ụlọ, e sitekwara nʼọzara bubata ndị ṅụbigara mmanya oke, ha na ọtụtụ ndị ọzọ, Ha gbanyekwara nwanyị a na nwanne ya nwanyị mgbaaka na nkwoji aka ha, yinyekwa ha okpueze mara mma nʼisi. 43Mgbe ahụ, ihe m kwuru banyere nwanyị ahụ ịkwa iko riri ahụ bụ nke a, ‘Ugbu a, ka ha mesoo ya mmeso dịka onye na-agba akwụna, nʼihi na nke ahụ ka ọ bụ.’ 44Ha bara dinakwuru ya. Dịka ndị ikom si abakwuru nwanyị akwụna, otu a ka ha si bakwuru ụmụ nwanyị ndụ ọjọọ a bụ Ohola na Oholiba. 45Ma ndị ikpe ezi omume ga-ama ha ụdị ikpe a na-ama ndị inyom na-akwa iko na ndị na-awụsikwa ọbara. Nʼihi na ha bụ ndị na-akwa iko, na ndị ọbara dị nʼaka ha. 46“Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, aga m akpọkọta igwe ndị mmadụ ga-emegide ha, nyefee ha nʼaka oke ihe egwu, nakwa ihe nlụta nʼagha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.