Native Bible

Ezekiel 23:41 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ị nọdụrụ nʼelu ihe ndina e doziri nke ọma, na tebul e doro nʼusoro dịkwa nʼihu ya nke ị dọbara ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na mmanụ oliv bụ nke m nʼelu ya.

Ezekiel 23:41 in English

Ezekiel 23:41 · Berean Standard Bible

You sat on a couch of luxury with a table spread before it, on which you had set My incense and My oil,

Context

39Nʼihi na nʼotu ụbọchị ahụ ha ji ụmụ ha chụọ aja nye arụsị ha, bụkwa ụbọchị ha batara nʼụlọnsọ m merụọ ya. Ihe dị otu a ka ha mere nʼụlọnsọ m. 40“Ọ bụghị naanị nke a, ha zigara ndị ozi ịkpọ ndị ikom na-esi ebe dị anya bịa, mgbe ha bịara, nʼihi ha, ị sachara ahụ gị nke ọma, tee ihe nʼanya gị, yirikwa ezigbo ihe ịchọ mma gị. 41Ị nọdụrụ nʼelu ihe ndina e doziri nke ọma, na tebul e doro nʼusoro dịkwa nʼihu ya nke ị dọbara ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na mmanụ oliv bụ nke m nʼelu ya. 42“Olu igwe mmadụ ndị obi dị ụtọ na-ada gburugburu ya nʼime ụlọ, e sitekwara nʼọzara bubata ndị ṅụbigara mmanya oke, ha na ọtụtụ ndị ọzọ, Ha gbanyekwara nwanyị a na nwanne ya nwanyị mgbaaka na nkwoji aka ha, yinyekwa ha okpueze mara mma nʼisi. 43Mgbe ahụ, ihe m kwuru banyere nwanyị ahụ ịkwa iko riri ahụ bụ nke a, ‘Ugbu a, ka ha mesoo ya mmeso dịka onye na-agba akwụna, nʼihi na nke ahụ ka ọ bụ.’

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.