Izikiel 22:4
Ezekiel 22:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Lee ka i si bụrụ onye ikpe mara nʼihi ọbara ị wụsiri. Leekwa ka i si bụrụ onye e merụrụ emerụ site nʼarụsị niile ị kpụrụ. I jirila aka gị mee ka ọgwụgwụ gị dị nso, leekwa na ọgwụgwụ gị dị nso, leekwa na ọgwụgwụ gị abịala nʼezie. Nʼihi ya, aga m eme gị ka ị bụrụ ihe nkọcha nye mba niile, na ihe ịkwa emo nye mba dị iche iche.
Ezekiel 22:4 in English
Ezekiel 22:4 · Berean Standard Bible
you are guilty of the blood you have shed, and you are defiled by the idols you have made. You have brought your days to a close and have come to the end of your years. Therefore I have made you a reproach to the nations and a mockery to all the lands.
Context
2“Ma gị onwe gị, Nwa nke mmadụ, ị ga-ekpe ya ikpe? Ị ga-ekpe obodo ọbara a ikpe? Mgbe ahụ, ị ga-eguzogide ya ihu nʼihu mee ka ọ mara ihe arụ niile o mere. 3‘Ị ga-asị, Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu: Gị obodo nke na-ewetara onwe gị mbibi nʼihi ọbara niile a na-awụsi nʼetiti gị, na arụsị niile i ji na-emerụ onwe gị. 4Lee ka i si bụrụ onye ikpe mara nʼihi ọbara ị wụsiri. Leekwa ka i si bụrụ onye e merụrụ emerụ site nʼarụsị niile ị kpụrụ. I jirila aka gị mee ka ọgwụgwụ gị dị nso, leekwa na ọgwụgwụ gị dị nso, leekwa na ọgwụgwụ gị abịala nʼezie. Nʼihi ya, aga m eme gị ka ị bụrụ ihe nkọcha nye mba niile, na ihe ịkwa emo nye mba dị iche iche. 5Ndị nọ gị nso na ndị nọ gị ebe dị anya ga-achị gị ọchị, gị obodo rụrụ arụ, na nke jupụtara nʼọgbaaghara. 6“ ‘Lee ka ndịisi Izrel nọ nʼime gị si e ji ike ha nwere na-awụsi ọbara.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.